Menu

Abụ Ọma 87

BIB

1 Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ; 2 Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb. 3 Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; Sela 4 “Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ “ 5 Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike." 6 Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn." 7 Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị."

Everything we make is available for free because of a generous community of supporters.

Donate