Abụ Ọma 75
BIB1 Anyị na-eto gị, O Chineke. Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche. 2 Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi. 3 Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi ya ike ka o guzo chịm. Sela 4 Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu. 5 Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ “ 6 Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ, maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu. 7 Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe; ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala. 8 Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị. 9 Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto, 10 bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu."
