Menu

Abụ Ọma 67

BIB

1 Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela 2 Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. 3 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị. 4 Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela 5 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị. 6 Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị. 7 Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

Everything we make is available for free because of a generous community of supporters.

Donate