Menu

Abụ Ọma 60

BIB

1 O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike; i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị. 2 I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji. 3 I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị. 4 Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela 5 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 6 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya. 7 Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m. 8 Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri." 9 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm? 10 Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha? 11 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu. 12 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

Everything we make is available for free because of a generous community of supporters.

Donate