Menu

Abụ Ọma 134

BIB

1 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị. 2 Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya ma toonu Onyenwe anyị. 3 Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa site na Zayọn gọzie unu.

Everything we make is available for free because of a generous community of supporters.

Donate