Menu

Abụ Ọma 128

BIB

1 Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. 2 Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. 4 Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị. 5 Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem, 6 ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.

Everything we make is available for free because of a generous community of supporters.

Donate